Joshua 7:1-26; 8:1-35

Lesson 52 - Elementary

Memory Verse
“Ịhu ego n’anya bu nkpọrọgwu nke ihe ọjọ nile di icheiche” (1 Timọti 6:10)
Notes

Joshua dọrọ ndị ahụ akanáantị ka ha ghara iwere ihe ọ bụla ma ọ bụghị ọlaedo, ọlaọcha na iko ndị ahụ eji ọla na ígwè mee nke ha nwereike itinye n’ụlọ Chineke. Chineke hụrụ anyị n’anya wee náagwa anyị mgbe nsogbu dị n’iru. Anyị gaenwe ọñụ ma anyị rubeeisi.

Mgbe ha weeresịrị Jeriko, ha gara n’iru imeri ebe ọzọ. Obodo a dị nta karịa Jeriko. Joshua duuru ndị agha olenaole wee jee. Ha kwere na Chineke gaanọnyere ha ma nyere ha aka dịka O mere na Jeriko. O wutara Joshua na ndị agha ya ma ju kwa ha anya mgbe ndị agha ya gbapụrụ site n’ebe ndị agha ntà ahụ nọ. Joshua kpereekpere wee jụọ Chineke ihe mere O nyereghị ha aka. Joshua sịrị na ya apụghị ịme ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na Chineke enyereghị ya aka. Joshua matara na ya apụghị ịjé n’ike nke ya ma ewezuga inyeaka nke Chineke. Baịbụl Nsọ naagwa anyị na anyị apụghị ime ihe ọ bụla ma ewezuga Chineke.

Chineke gwara Joshua na otù onye enupụworo Chineke isi wee zuo ori, nke a mere na O nweghị ike inyere ha aka. Chineke gwara Joshua ka ọ chọpụta onye ahụ ma nye ya ntaramahụhụ. Akpọtaara Joshua ụmụmmadụ ma ọ hụghị mmehie n’ebe ha nọ, ma mgbe Ekan bịara n’iru Joshua, Joshua gwara ya ka o kwuo ihe o mere. Ọ gaabụworị Chineke gosịrị ya. Ekan wee kwupụta na ya zuru uwemwụda, ụfọdụ ọlaedo na ego ụfọdụ. Izuori bụ mmehie. Ekan echèghị na onye ọ bụla hụrụ ihe o zuru, ma Chineke naahụ ihe niile anyị naeme. Anyị apụghị izo onweanyị n’ebe Chineke nọ.

Joshua were uwemwụda ahụ, ọlaedo na ego ahụ site n’aka Ekan wee gbaa ha ọkụ. Joshua nyere Ekan na ndị èzínaụlọ ya ntaramahụhụ. Chineke chọrọ igosi ndị ahụ na ọ bụ ihe jọgburu onweya inupụrụ Ya isi. Ekan wetaara onweya na ndị èzínaụlọ ya nsogbu na ntaramaahụhụ. Mgbe mmadụ mere mmehie, ọ na ewetakwara ndịọzọ ihe atụ ọjọọ. Ọtụtụ oge ndị nnenanna naata ahụhụ n’ihi npupụisi nke ụmụ ha.

Anyị hụrụ na ndịa meriri mgbe ha rubeere Chineke isi, ma emeriri ha mgbe ha nupụrụisi. Nke a naakụziri anyị na ọ dịmma ime ihe Chineke chọrọ ka anyị mee, ma mee ya n’ihi na anyị hụrụ Ya n’anya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere ndịiro ụmụ Israel ji merie ha? Joshua 7:13
  2. Òlee otú Joshua si chọpụta onye mehiere? Joshua 7:16-18
  3. Gịnị ka Joshua gwara Ekan? Joshua 7:19
  4. Gịnị bụ ihe ahụ náadịghị mma Ekan mere? Joshua 7:21
  5. Gịnị ka Onyenweanyị kwuru banyere anyaukwu? Ọpupu 20:17