Ọpupu 20:1-26

Lesson 34 - Elementary

Memory Verse
“Ọ bu Mu onwem; unu atula egwu (Jọn 6:20).
Notes

Mgbe ndị ahụ hụrụ àmụmà na anwụrụọkụ ahụ wee nụ ụda égbèeluigwe ahụ, ha matara na Chineke nọ n’ugwu ahụ. Moses gwara ha atụla egwu ma ọ bụrụ na ha emewo ihe Chineke sịrị ha mee. Egwù tụrụ ha ịnụ olu nke Chineke, ha wee rịọ Moses ka o kwuere ha. Chineke gwara ndị ahụ okwu site n’elu ugwu n’ụzọ ha nwereike ịnụ. Ọ gwara ha na Ya bụ Onyenwe ha Chineke Onye dupụtara ha site n’Ijipt ma náelekọta ha na njèm ha niile. Ọ chọrọ ka ha mata na ha aghaghị ịtụkwasị Ya obi ma rubekwara Ya isi.

Chineke gwara ndị ahụ ihe anyị náaghaghị imere Ya na ihe anyị náaghaghị imere ndị mmadụ ndịọzọ. Ọ kwuru na anyị aghaghị ịhụ Chineke n’anya karịa ihe niile ọ bụla.

O kwuru na anyị agaghị efè chi ọzọ òfùfè. Anyị agaghị añụ iyi. Anyị ganaasọpụrụ Chineke, sọpụrụ kwa nnenanna anyị.

Anyị agaghị egbu onye ọ bụla

Anyị agaghị ezuori

Anyị agaghị ekwu okwu ụgha

Anyị agaghị achọ ihe ndịọzọ

Chineke kpọrọ Moses ka ọ bịakute Ya n’elu ugwu wee nye ya mbadamba nkume n’elu ebe O dere iwu ndị ahụ dị icheiche. Moses nọrọ n’ugwu ahụ ụbọchị irianọ. Chineke wee gwa ya ihe ụmụmmadụ ahụ kwesịrị ima.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye nyere Moses Iwu Iri ahụ?
  2. Ndị ahụ ọ tụrụ egwù mgbe ahụ alaọmajijiji mara n’Ugwu Sainai? Ọpupu 20:18
  3. Gịnị ka ndị ahụ gwara Moses mgbe ọ gwasịrị ha okwu? Ọpupu 20:19
  4. Mụọ Ọpupu 20 amaokwu nke 3 na 12 n’isi.