Jenesis 42:1-38; 43:1-34

Lesson 12 - Elementary

Memory Verse
“Unu ejila onye ọ bula ugwọ ọ bula, ma-ọbughi ihurita onwe-unu n’anya” (Ndi Rom 13:8).
Notes

Mgbe Josef gwara eze ahụ ihe nrọ ya pụtara, obi tọrọ eze ahụ ụtọ nke ukwuu n’ebe Josef nọ o wee mee ya onye ọchịchị n’ala ahụ. Eze gwara Josef ka ọ zụọ ihe oriri, ma chekwa ya rue arọ asaa ọjọọ ahụ. Josef wee kwakọba ọka n’oge nrijuafọ nke ala ahụ n’ime ọba ukwu dị icheiche.

Arọ asaa maramma agafela, arọ asaa ọjọọ amalite. Ubi niile wee kpọnkụ. Ọtụtụ ndị mmadụ erichaala ọka ha kpokọbara, ha wee bịa ka eze nyere ha aka. Eze wee zipụ ha ijekuru Josef onye meghere ọba ukwu dị icheiche wee ná resị ụmụmmadụ ihe oriri.

Mgbe ndị bi n’obodo ebe nna Josef na ụmụnne ya risịrị ọka ha niile, ndị ahụ bịakutere Josef ka ha wee ghara ịnwụ n’ihi agụụ. Nna Josef na ụmụnne ya nwere ego n’ebe ọdị ukwu, ma ọbụrụ na nri adịghị, ego apụtaghị ihe ọ bụla.

Jekob zipụrụ ụmụ ya ndịokenye iri ka ha jee Ijipt zụta ọka ebe ekpokọbara ya n’ọba ukwu dị icheiche. Ọ tụrụ egwu ịrapụ nwa ya nke nta isoro ha jee ka ihe ọ bụla ghara ime ya.

Ụmụnne Josef mesịa bịakute ya ịzụ ihe oriri. Josef gbara arọ irinaatọ mgbe erere ya. Ugbua ọdị ukwuu, yie uwe ka nwa nwoke eze, ma nọkwasị n’ocheeze, ha amataghị ya. Josef matara ụmụnne ya ngwangwa ọ hụrụ ha.

Josef chọrọ ịmata ihe banyere ha: ma o nwere ike ịbụ na ha dị mma ugbua karịa mgbe ha rere ya, n’ihi nke a o gosighị ha onweya. Ụmụnne ya ahụ gwara ya na ha nwere nwanne nwoke nta n’ụlọ. Mgbe ahụ Josef gwara ha na ya naaga ijide otù nime ha rue mgbe ha dutara nwanne ha nwoke nke nta.

Mgbe ụbọchị atọ gasịrị ha naalaghachi, o mesoro ha nkeọma. Ọ gbagharala ha ihe ọjọọ niile ha mere ya. O mere ka ekpojue ọka maramma n’akpa ha, ma tighachiri ha ego ha nyere maka ọka ndị ahụ n’akpa ha.

Mgbe ha gwara nna ha banyere nwoke ahụ pụrụ iche nke naachị ala ahụ onye chọrọ ka ha kpọta nwanne ha nwoke nta, egwu tụrụ ya. Josef anọghịkwa, o wee tụọ egwu na Benjamin nwere ike ịnwụ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka Josef ji ọka ahụ o kpokọbara mee?
  2. Gịnị ka ndị ahụ mere mgbe ha risịrị nri ha?
  3. Onye bịakutere Josef maka nri?
  4. Òlee ụdị mmeso ọma o mesoro ụmụnne ya? Jenesis 42:25
  5. Onye ka Josef chọrọ ịhụ? Jenesis 42:20