Jenesis 22:1-19

Lesson 8 - Elementary

Memory Verse
“Umu, nāñanu nti okwu ndi muru unu n’ihe nile” (Ndi Kọlọsị 3:20).
Notes

Abraham rubeere Chineke isi, ma gaa kwa n’obodo ahụ Chineke chọrọ ka ọ gaa. Chineke nyere Abraham ọtụtụ anụụlọ. Chineke nyere ya ọlaọcha na ọlaedo n’ebe ọdị ukwuu. Chineke chèbèrè Abraham , ma nyere ya aka.

Abraham na Sera nwunye ya enweghị nwa ọ bụla. Chineke chọrọ ka ha nwee nwa nwoke, n’ihi na Chineke matara na Abraham gaakuziri nwa ya ịhụ Chineke n’anya ma rubere Ya isi, ka Chineke wee mee ụmụ ya na ụmụụmụ ya ngọzi ukwuu nye ụwa niile. Agaamụ Jisọs site n’otù n’ime èzínaụlọ ha.

Chineke gwara Abraham na ya gaenye ya otù nwa nwoke. Abraham kwere na Chineke gaeme ya, n’ihi na ọ bụrụ na Chineke kwe mkwà Ọ gaemezu ha niile. Abraham cheere náenwetaghị nwa ahụ; ma ọ nọ náekwere na Chineke gaemezu ihe O kwere ná mkwà.

Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, Chineke nyere Abraham na Sera otù nwa. Aha ya bụ Aisak. Abraham hụrụ Aisak n’anya n’ebe ọdị ukwuu, náenweghị obiabụọ o ji obi ya niile kelee Chineke n’ihi nwa nwoke a dị óké ọnụahịa O nyere ya.

Otù ụbọchị, Chineke gwara Abraham ka o nyeghachị Ya Aisak. Ọ gaabụrị ihe siriike nye Abraham inwe mmasị inye otù nwa nwoke o nwere, ma n’ihi na ọ bụ Chineke chọrọ Aisak, Abraham nwere mmasị inye ya Chineke. O kwere na Chineke pụrụ ime ka Aisak dị ndụ ọzọ ma ọ bụrụ na ọ nwụọ. Ihe Abraham tọrọ Chineke ụtọ n’ihi na ọ hụrụ Chineke n’anya ebe ọ dị ukwuu nke inye Ya ihe ya kachasị mma bụ nke ọ hụkarịsịrị n’anya. Chineke ọ bụghị náánị na O nyeghachiri Abraham nwa ya nwoke Aisak, ma O nyekwara Abraham ọtụtụ ihe dị mma.

Chineke naenye anyị ọtụtụ ihe karịa otú anyị pụrụ inye Ya mgbe ọ bụla. Ma anyị pụrụ inye Ya ekele. Anyị nwere ike hụ Ya n’anya ma náeme ihe ndị ahụ n’atọ Ya ụtọ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ọtụtụ ịhụn’anya Abraham nwere n’ebe Chineke nọ?
  2. Gịnị mere Chineke ji chọọ ka Abraham nwee nwa nwoke?
  3. Ònye ka agaamụ site n’èzínaụlọ Abraham mgbe emesịrị?
  4. Gịnị bụ aha Abraham na Sera kpọrọ nwa ha nwoke?
  5. Gịnị ka Chineke gwara Abraham ka o were Aisak mee?
  6. Gịnị mere Abraham ji nwee mmasị iwere Aisak nye Chineke?
  7. Gịnị ka anyị nwere ike inye Chineke n’ihi ọtụtụ ngọzi niile dị icheiche anyị natara?