Jenesis 6 na 7

Lesson 4 - Elementary

Memory Verse
“Ndi mọ-ozi Ya ka Ọ gēnye iwu banyere gi” (Luk 4:10)
Notes

Mgbe Adam na Iv nupụrụisi nye Chineke ha webata mmehie na ọnwụ n’ime ụwa. Oge náadịghị anya mgbe nke a mesịrị, ụmụmmadụ wee jọọnjọ nke mere na Chineke kpebiri izita óké ijummiri n’eluụwa iji bibie ihe niile. Ma ọ dị otù nwoke, Noa, onye hụrụ Chineke n’anya ma náagbalị ime ihe gaatọ Chineke ụtọ, n’ihi nke a Chineke chọrọ ichébe ya na èzínaụlọ ya.

Chineke gwara Noa ka o wue ụgbọ ukwu ebe ya na èzínaụlọ ya gaebi oge mmiri gaejupụta ụwa niile. Ọ gwara Noa otú ọ gaesi ewu ya na otú ọ gaara n’ibu.

Agwara Noa ka o weba anụ ọ bụla ụdị ya abụọ abụọ nime ụgbọ ahụ, na ka o tinye kwa ihe oriri n’ụgbọ ahụ maka èzínaụlọ ya na kwa anụ ndị ahụ. Nime anụ niile dị ọcha agwara ya ka ọ chịpụta ha asaa asaa n’ụdị ha. Noa mere ya nnọọ otú Chineke gwara ya ka o si mee ya. O were ya ọtụtụ arọ iji wue ụgbọ ukwu ahụ. O nwere ike ụmụmmadụ naachị ya ọchị na ọ naewu ụgbọ ebe mmiri náadịghị, ma Noa matara ihe Chineke gwara ya o wee nọgidesike n’iwu ya.

Noa kwusaara ụmụmmadụ banyere ihe óké egwu nke gaabịakwasị ụwa ma dọọ kwa ha akanántị ka ha kwụsị ime ihe ọjọọ. Oge ewusịrị ụgbọ ahụ, Chineke gwara Noa ka ọ baa nime ụgbọ ya na nwunye ya na èzínaụlọ ya niile. Mgbe ahụ Chineke kpọchiri ụzọ ahụ.

Ụbọchị irianọ ehihie na abalị, mmiri òzùzò wụpụrụ site n’igwe ojii. Mmiri sitere ná isiiyi niile na ogbu mmiri niile nke ụwa na osimiri niile bịa.

Mgbe ihe ndịa mesịrị ndị ahụ kwere Noa. Ha wee kwaákwá tie óké mkpu; ha chọrọ ka azọpụta ha ugbu a. Ma oge nzọpụta agafewo. Chineke akpọchiela ụzọ, Noa maọbụ onye ọ bụla ọzọ apụghị imeghe ya. Ndị ahụ ji ya eme ihe ọchị mgbe ha kwesịrị ikpeekpere nọ n’ezi ugbu a, náemikpu ngwangwa n’ime mmiri.

Otù aka ahụ n’ụwa taa, ọtụtụ ụmụmmadụ dị njọ nke ukwuu. Ha ahụghị Chineke n’anya, ha achọghị kwa ime ihe gaatọ Ya ụtọ. Oge óké mkpagbu gaabịakwasị ụwa n’ihi ajọomume nke ụmụmmadụ.

Ọ bụrụ na azọpụtabeghị gị, kpeekpere ngwangwa gwa Jisọs ka Ọ zọpụta mkpụrụobi gị ka i wee ghara iketa òkè n’óké mkpagbu ahụ nke gaabịakwasị ụwa. Jisọs naabịa ịkpọpụta ndị hụrụ Ya n’anya náerubere Ya isi n’ụwa.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị gaeme n’ihi omume ọjọọ nke ụmụmmadụ?
  2. Onye bụ nwoke ahụ nke ya na èzínaụlọ ya hụrụ Chineke n’anya ma naerubekwara Ya isi?
  3. Gịnị ka Chineke nyere Noa iwu ka ome?
  4. Gịnị ka Chineke mere tupu ijummiri ahụ abịa?
  5. Gịnị ka ndị ahụ mere mgbe ijummiri ahụ bịasịrị?
  6. Gịnị ka anyị gaeme iji gbanarị óké mkpagbu ahụ nke naabịa n’ụwa mgbe náadịghị anya?