Jenesis 2 na 3

Lesson 2 - Elementary

Memory Verse
“Onye m’huru n’anya, eñomila ihe ọjọ” (III Jọn 11)
Notes

Chineke hụrụ na ihe niile O kèrè maramma nke ukwuu; O wee zueike n’ụbọchị nke asaa ma gọziekwa ya. Chineke doziri otù ogige maramma nye Adam nye kwa ndị ya na ya gaanọ. O nyere ha osisi nwere ezi mkpụrụ, òkòkò ọhịa maramma dị icheiche, akwụkwọ nri na ọtụtụ ihe ndịọzọ maramma nime ogige ahụ. Chineke gwara Adam na o nwere ike iri mkpụrụ osisi niile ahụ ma ewepụ otù n’ime osisi ndị ahụ. Ọ bụrụ na ha erie mkpụrụ nke ahụ na ha gaanwụrịrị. Ọ gwara ha ka ha ghara ịmetụ osisi ahụ aka maọlị.

Chineke sịrị na ọ dịghị mma ka Adam nọrọ náánị ya; ya mere mgbe Adam naararụra Chineke were otù ọgịrịga n’arụ Adam wee mee nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.

Enwere ọtụtụ anụmanụ na ogige ahụ. Adam nyere ha niile aha. Ọ bụghị agwọ niile nwere ihe ọgbụgba náeweta ọnwụ, ma ọdị otù agwọ dị n’ogige ahụ jọgburu onweya. Ọ bụ agwọ a jọrọnjọ bụ nke gwara Iv ka o rie site ná mkpụrụ ahụ Chineke gwara ha erila. O rie, ma nye kwa Adam ka o rie, site na nke a ha wee nupụrụ Chineke isi. Ọtụtụ mgbe ndị enyi anyị naachọ ka anyị mee ihe náadịghị mma o nwere ike ịbụ ebe anyị naegwuriegwu maọbụ n’ụlọakwụkwọ, ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe Jisọs n’ime obi anyị, anyị ekwesịghị ige ha ntị. Mgbe ụfọdụ Chineke naabịa gwusị ha egwu n’ogige ahụ. Náagbaghị agụgọ ha naenwe ọñụ mgbe Ọ naabịa nọnyere ha. Ma mgbe ha nupụrụisi site n’iri mkpụrụ ahụ Chineke achọghị ka ha rie, ha tụrụ egwù mgbe ha nụrụ olu Chineke. Ha gbalịa izo. Ma anyị enweghị ike izopụ n’iru Chineke. Chineke kpọrọ ha. Ọ jụrụ ha ma ha eriela mkpụrụosisi ahụ Ọ gwara ha ka ha ghara iri. Ha malitere ịnaenye ihe ngọpụ dị icheiche. Ọ bụ mgbe anyị mere ihe anyị n’ekwesịghị ime ka anyị náamalite inye ihe ngọpụ.

Chineke chụpụrụ ha n’ogige a maramma n’ihi na ha nupụrụisi ma doo onye mmụọozi ka o chee ọnụụzọ ama ya nche.

Adam na Iv mere ihe jọgburu onweya mgbe ha nupụrụ Chineke isi; ọ bụ nke a wetara mmehie, nrịanrịa, na ọnwụ na ọtụtụ ihe ndịọzọ jọrọnjọ n’ime ụwa niile. Mgbe anyị mere ihe náadịghị mma anyị naeme ka onyeọzọ mee kwa ihe ọjọọ, ma ọ bụrụ na anyị akpọ Jisọs ka ọ bata n’ime obi anyị, Ọ gaenyere anyị aka ime ihe dị mma.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Mmadụ o nwere ike iri mkpụrụosisi niile dị na ogige ahụ?
  2. Ònye nyere Iv mkpụrụ ahụ ka o rie?
  3. Gịnị mere Adam ji zoo n’ebe Chineke nọ?
  4. Gịnị wetara nrịanrịa na ọnwụ n’ime ụwa?