Jenesis 1:1-31

Lesson 1 - Elementary

Memory Verse
“Ekère ihe nile site n’aka Ya” (Jọn 1:3).
Notes

Chineke nwere ike ime ihe niile. Ọ bụ náánị ka O kwueokwu o wee mezue. Ọchịchịrị gbachiri nime ụwa n’otù oge, Chineke wee sị: “Ka ìhè di” ìhè wee dị. Chineke wee kpọ ìhè ahụ “Ehihie” ọchịchịrị ahụ ka Ọ kpọkwara “Abalị.”

N’ụbọchị nke abụọ Chineke wee mee igweojii maramma nke náezo mmiri náeme ka ókókó osisi ukwu, na ihe ọkụkụ n’étóétó, ka nri wee dịrị ụmụmmadụ na anụmanụ. Chineke wee chịkọta mmiri niile nime osimiri dị icheiche dị obosara dị kwa omimi, wee mee ka alàákọrọ dị n’ọnọdụ ha niile. O wee kpara osimiri ókè ebe ha náagaghị agabiga, O wee dị otú a.

O wee were ahịhịa ndụ na ókókó osisi maramma kpuchie ụwa. Chineke kèrè ụwa maramma n’ihi ndịkom, ndịnyom, ụmụntakịrị ndị nwoke na ndị nwanyị ndị Ọ ga ekè.

N’ụbọchị nke anọ, Chineke wee mee Anyanwụ inye ìhè n’ehihie na ọnwa na kpakpando niile inye ìhè n’abalị. Mgbe Chineke kesịrị ìhè ahụ niile ma doziekwa ebe mmadụ gaebi, O tinye azụ dị icheiche nime osimiri ya na anụufé niile nime eluigwe.

Chineke kèrè ụwa maramma wee tinye mmadụ ibi nime ya. Chineke wee lee ụwa ahụ O kere anya wee sị na ọ dị mma. O wee site ná ájá kpụọ mmadụ wee kunye ume ndụ nime ya.

Ugwu niile na óké osimiri niile na ókókó osisi niile na ihe niile nke Chineke kèrè naegosi na Chineke dị mma, ma ọbụ náánị mmadụ pụrụ ịhụ Ya n’anya. Ụmụntakịrị nwoke, na ụmụntakịrị nwanyị niile, ndịkom na ndịnyom niile nime ụwa chọrọ ka ahụ ha n’anya. Chineke chọrọ ka anyị hụ Ya n’anya. O kere mụ na gị ịhụ Ya n’anya feé kwa Ya òfùfè.

Ihe kwesịrị ka anyị mee bụ ịhụ Chineke n’anya rubere Ya isi. Ọ ga echébe anyị nye kwa anyị ọñụ. Ọ bụrụ na anyị ahụ Ya n’anya rubekwara Ya isi mgbe niile, otù ụbọchị Ọ gaakpọrọ anyị laa n’Eluigwe ibinyere Ya ebighịebi.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee otú Chineke si kéé ụwa?
  2. Gịnị ka Chineke kèrè n’ụbọchị nke mbụ?
  3. Kpọọ aha ihe niile Chineke kèrè tupu O kee mmadụ.
  4. Gịnị ka Chineke ji kéé mmadụ?
  5. Gịnị mere O ji kéé mmadụ?
  6. Gịnị ka anyị gaeme iji nwe ọñụ ma jikere kwa ịbà n’Eluigwe.